8 Nuru, ndim, M'gāb͕a àmà megide gi:Israel, ọ gādim nọ̄ nma ma ọ buru na i gēgem nti!
9 Ọ dighi chi ala ọzọ gādi nime gi;I gaghi-akpọ kwa isi ala nye chi mba ọzọ.
10 Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-gi,Nke nēme ka i si n'ala Ijipt rigoputa:Meghe ọnu-gi ka ọ sa mbara, M'gēmeju kwa ya.
11 Ma ndim egeghi nti olum;Israel ekweghikwam.
12 M'we zilaga ha n'isi-ike nke obi-ha,Ka ha we nējeghari na ndum-ọdu nile ha.
13 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ndim ganēgem nti,Ma asi na Israel gēje ije n'uzọm nile!
14 Nwa mb͕e ka M'gēji me ka ndi-iro-ha ruru ala,Ọ bu kwa imegide ndi nākpab͕u ha ka M'gēchighari akam.