2 N'ihi na, le, ndi-iro-Gi nāb͕a aghara:Ọzọ, ndi nākpọ Gi asì ebuliwo isi-ha.
3 Ọ bu imegide ndi-Gi ka ha nāb͕a ìzù aghughọ,Ha nāb͕a ìzù imegide ndi-Gi edebeworo na nzuzo.
4 Ha asiwo, Jenu, ka ayi zopu ha n'ibu mbe;Agaghi-echeta kwa aha Israel ọzọ.
5 N'ihi na ha ewerewo otù obi b͕arita ìzù;Ọ bu imegide Gi ka ha nāb͕a ndu:
6 Ulo-ikwū nile nke Edom na ndi Ishmael;Moab na ndi Haga;
7 Gebal, na Amon, na Amalek;Filistia, ya na ndi bi na Taia:
8 Asiria araparawo kwa n'aru ha;Ha aghọworo umu Lot ogwe aka. Selah