6 Ulo-ikwū nile nke Edom na ndi Ishmael;Moab na ndi Haga;
7 Gebal, na Amon, na Amalek;Filistia, ya na ndi bi na Taia:
8 Asiria araparawo kwa n'aru ha;Ha aghọworo umu Lot ogwe aka. Selah
9 Me ha otú I mere Midian;Otú I mere Sisera, otú I mere Jebin nime miri-iyi Kaishon:
10 Ekpochapuru ha n'En-doa;Ha ghọro ǹsí eji mezi ala.
11 Me ndi-ha amara aha-ha ka ha di ka Oreb, na dika Zeeb;Me kwa ka ndi-isi-ha nile di ka Zeba na dika Zalmuna:
12 Ndi siri, Ka ayi nwetara onwe-ayiEbe-obibi nile nke Chineke.