8 Asiria araparawo kwa n'aru ha;Ha aghọworo umu Lot ogwe aka. Selah
9 Me ha otú I mere Midian;Otú I mere Sisera, otú I mere Jebin nime miri-iyi Kaishon:
10 Ekpochapuru ha n'En-doa;Ha ghọro ǹsí eji mezi ala.
11 Me ndi-ha amara aha-ha ka ha di ka Oreb, na dika Zeeb;Me kwa ka ndi-isi-ha nile di ka Zeba na dika Zalmuna:
12 Ndi siri, Ka ayi nwetara onwe-ayiEbe-obibi nile nke Chineke.
13 Chinekem, me ka ha di ka ihe nke ifufe nēfeghari buruburu,Dika ahihia n'iru ifufe.
14 Dika ọku nke nēré oke ọhia,Na dika ire-ọku nke nēme ka ugwu nile nwuru ọku;