3 Ọbuná nnunu di ntà achọtawo ulo,Eléké achọtawo-kwa-ra onwe-ya akwu, ebe o tiyeworo umu-yaBú ebe-ichu-àjà-Gi nile, Jehova nke usu nile nke ndi-agha,Ezem na Chinekem.
4 Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi bi n'ulo-Gi bu:Ha gānọ nēto Gi. Selah
5 Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu nke ike o nwere di na Gi;Uzọ nile atuliri atuli ijeru Zaion di ha n'obi.
6 Mb͕e ha nāgabiga ndagwurugwu Baka ha nēme ya ka ọ buru ebe isi-iyi di iche iche;Ọzọ, miri-ozuzo mbu nēwere ngọzi nile kpuchie ya.
7 Ha nēsi n'ike jerue ike,Anēme ka Chineke hu onye ọ bula nime ha nime Zaion.
8 Jehova, Chineke nke usu nile nke ndi-agha, nu ekperem:Ṅa nti, Gi Chineke nke Jekob. Selah
9 Le ọta-ayi, Chineke,Legide kwa iru onye-Gi etere manu.