7 Ha nēsi n'ike jerue ike,Anēme ka Chineke hu onye ọ bula nime ha nime Zaion.
8 Jehova, Chineke nke usu nile nke ndi-agha, nu ekperem:Ṅa nti, Gi Chineke nke Jekob. Selah
9 Le ọta-ayi, Chineke,Legide kwa iru onye-Gi etere manu.
10 N'ihi na otù ubọchi n'ogige-Gi nile di nma kari nnù ubọchi abua na ọgu iri n'ebe ọzọ.Arọputawom iguzo na nbata-uzọ n'ulo Chinekem,Kari ibi n'ulo-ikwū nile nke nmebi-iwu.
11 N'ihi na anyanwu na ọta ka Jehova, bú Chineke, bu:Amara na nsọpuru ka Jehova gēnye:Ọ gaghi-eb͕ochi ezi ihe n'ebe ndi nējeghari n'izu-okè nọ.