1 Jehova, ihe ala-Gi atọwo Gi utọ:I mewo ndi Jekob adọtara n'agha ka ha lata.
2 I bupuwo ajọ omume ndi-Gi,I kpuchiwo nmehie-ha nile. Selah
3 I kpochapuwo nrubiga-ókè nke iwe-Gi:I siwo n'di-ọku nke iwe-Gi chighari Onwe-gi.
4 Me ka ayi lata, Chineke nke nzọputa-ayi,Me ka ọ gwusia, bú iwe ayi nākpasu Gi.
5 Ọ̀ bu rue mb͕e ebighi-ebi ka I ganēwesa ayi iwe?Ì gēme ka iwe-Gi digide rue ọb͕ọ nile?
6 Gì onwe-gi agaghi-eme ka ayi di kwa ndu ọzọ:Ka ndi-Gi we ṅuria nime Gi?
7 Jehova, me ka ayi hu ebere-Gi,Nye kwa ayi nzọputa-Gi.