7 Jehova, me ka ayi hu ebere-Gi,Nye kwa ayi nzọputa-Gi.
8 M'gānu ihe Chineke, bú Jehova, gēkwu:N'ihi na Ọ gāgwa ndi-Ya, gwa kwa ndi-ebere-Ya, okwu udo:Ma ka ha ghara ilaghachi ba n'ihe-nzuzu.
9 Otú ọ di, nzọputa-Ya di nso ndi nātu egwu Ya;Ka nsọpuru we biri n'ala-ayi.
10 Ebere na ezi-okwu ezutewo;Ezi omume na udo esutuwo ọnu.
11 Ezi-okwu nēpú epú n'ala;Ezi omume esiwo kwa n'elu-igwe lepu anya.
12 Ọzọ, Jehova gēnye ezi ihe;Ala-ayi gēnye kwa ihe-ọmume-ya.