1 Jehova, tọ nti-Gi n'ala, zam;N'ihi na onye ewedara n'ala na ob͕eye ka m'bu.
2 Debe nkpuru-obim; n'ihi na onye-ebere ka m'bu:Gi onwe-gi Chinekem, zọputa orù-Gi nke nātukwasi obi na Gi.
3 Merem amara, Onye-nwe-ayi;N'ihi na Gi ka m'nākpọku ogologo ubọchi nile.
4 Me ka nkpuru-obi orù-Gi ṅuria;N'ihi na ọ bu Gi, Onye-nwe-ayi, ka m'nēbuli nkpuru-obim nye.