17 N'ihi na ima-nma nke ike-ha ka I bu:Ọ bu kwa n'utọ ihe-ayi nātọ Gi ka mpi-ayi nādi elu.
18 N'ihi na Jehova nwe ọta-ayi;Ọ bu kwa Onye Nsọ nke Israel nwe eze-ayi.
19 Mb͕e ahu I gwara ndi-ebere-Gi okwu n'ọhù,Si, Atukwasiwom iye-aka n'aru dike;Emewom ka otù onye arọputaworo n'etiti ndim di elu.
20 Achọtawom Devid, bú orùm;Ewerewom manu nsọm te ya:
21 Onye akam gēguzosi ike n'ebe ọ nọ;Ọzọ, ogwe-akam gāb͕a ya ume.
22 Onye-iro agaghi-abiakwasi ya na mberede;Ọzọ, nwa nke ajọ omume agaghi-eweda ya n'ala.
23 M'gētipia kwa ndi nākpab͕u ya n'iru ya,Ti kwa ndi nākpọ ya asì ihe.