3 Nēji ubọ nke akwara iri, nēji kwa une;Nēji higgaion n'elu ubọ-akwara.
4 N'ihi na I mewo ka m'ṅuria site n'ọlu-Gi, Jehova:Ọ bu n'ọlu nile nke aka-Gi ka m'gēti nkpu ọṅù.
5 Le ka ọlu-Gi nile si di uku, Jehova!Èchìchè-Gi miri emi nke-uku.
6 Madu nke bu anu-ọhia adighi-ama ama;Onye-nzuzu adighi-aghọta kwa nka:
7 Mb͕e ndi nēmebi iwu nāma akwukwọ dika ihe-ọkukú,Mb͕e ndi nile nke nalu ajọ ihe nāwa kwa okoko-osisi;Ọ bu ka ewe kpochapu ha rue mb͕e nile ebighi-ebi:
8 Ma Gi onwe-gi nọ n'ebe di elu rue mb͕e ebighi-ebi, Jehova.
9 N'ihi na, le, ndi-iro-Gi, Jehova,N'ihi na, le, ndi-iro-Gi gāla n'iyì;Ndi nile nke nālu ajọ ihe gēkesa onwe-ha.