7 Mb͕e ndi nēmebi iwu nāma akwukwọ dika ihe-ọkukú,Mb͕e ndi nile nke nalu ajọ ihe nāwa kwa okoko-osisi;Ọ bu ka ewe kpochapu ha rue mb͕e nile ebighi-ebi:
8 Ma Gi onwe-gi nọ n'ebe di elu rue mb͕e ebighi-ebi, Jehova.
9 N'ihi na, le, ndi-iro-Gi, Jehova,N'ihi na, le, ndi-iro-Gi gāla n'iyì;Ndi nile nke nālu ajọ ihe gēkesa onwe-ha.
10 Ma I mewo ka mpim di elu dika mpi atu:Ejiwo manu ọhu wusam.
11 Anyam elekwasiwo kwa ndi nēchem anwu,Ihe bayere ndi nēbili imegidem, bú ndi nēme ihe ọjọ, ka ntim abua nānu.
12 Onye ezi omume gāwa igù dika nkwu:Dika osisi cedar nime Lebanon ka o gēbù ibù.
13 Ndi akuworo n'ulo Jehova dika osisiGāma akwukwọ n'ogige nile nke Chineke-ayi.