1 Jehova bu eze; idi-elu ka O yiriworo dika uwe;Jehova eyiriwo uwe, O werewo ike ke Onwe-ya n'úkwù:Ọzọ, elu-uwa dum madu bi nēguzosi ike, adighi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya.
2 Oche-eze-Gi eguzosiwo ike site na mb͕e ochie:Site na mb͕e ebighi-ebi ka I nọ.
3 Osimiri eweliwo olu-ha, Jehova,Osimiri eweliwo olu-ha;Osimiri nēweli ebili-miri nile ha elu.
4 Kari olu nile nke ọtutu miri,Kari ebili-miri nile di ebube nke oké osimiri,Jehova Nke nọ n'ebe di elu di ebube.