1 Chineke nke ọ́bọ̀ nile, Jehova,Chineke nke ọ́bọ̀ nile, nwuputa ìhè.
2 Bulie Onwe-gi, Onye-ikpe nke uwa:Nyeghachi ndi-npako nmeso-ha.
3 Jehova, rùe ole mb͕e ka ndi nēmebi iwu,Rùe ole mb͕e ka ndi nēmebi iwu gāṅuri ọṅu-agha?
4 Ha nēkwuwa okwu-ọnu, ha nēkwu oké okwu:Ndi nile nke nālu ajọ ihe nānya isi.
5 Ndi-Gi ka ha nāzọpia, Jehova,Ọ bu kwa ihe-nketa-Gi ka ha nēweda n'ala.