13 Ime ka ọ nọ jū pua n'ubọchi nile nke ihe ọjọ,Rue mb͕e agēgwuru onye nēmebi iwu olùlù.
14 N'ihi na Jehova agaghi-ara ndi-Ya aka,Ọ gaghi-arapu kwa ihe-nketa-Ya.
15 N'ihi na ikpé gālaghachikute ezi omume:Ndi nile ndi ziri ezi n'obi gēso kwa ya.
16 Ònye gēbilirim imegide ndi nēme ihe ọjọ?Ònye gēme onwe-ya ka o guzosierem ike imegide ndi nālu ajọ ihe?
17 Ọ buru na Jehova abughi onye nēyerem aka,Ọ fọduru nwa mb͕e nkpuru-obim gēbiwori n'ebe inọ-dū.
18 Ọ buru na asiwom, Ewezugawo ukwum n'ọnọdu-ya;Ebere-Gi nākwagidem, Jehova.
19 Mb͕e ncheb͕um nāba uba n'imem,Nkasi-obi-Gi nile nāgugu nkpuru-obim.