17 Ọ buru na Jehova abughi onye nēyerem aka,Ọ fọduru nwa mb͕e nkpuru-obim gēbiwori n'ebe inọ-dū.
18 Ọ buru na asiwom, Ewezugawo ukwum n'ọnọdu-ya;Ebere-Gi nākwagidem, Jehova.
19 Mb͕e ncheb͕um nāba uba n'imem,Nkasi-obi-Gi nile nāgugu nkpuru-obim.
20 Àgējikọta Gi na oche-eze nke ihe-ila-n'iyì nile,Nke nēji ukpuru kpuzí nmeb͕u?
21 Ha nēdo onwe-ha n'usu ndi nāpunara madu ihe imegide nkpuru-obi onye ezi omume,Ọ bu kwa ọbara nēmeghi ihe ọjọ ka ha nāma ikpe.
22 Ma Jehova aburuworom ulo-elu;Chinekem bu kwa oké nkume nke ebe-nb͕abàm.