1 Bianu, ka ayi tikue Jehova nkpu ọṅù:Ka ayi tikusie oké nkume nke nzọputa-ayi nkpu ọṅù ike.
2 Ka ayi were ekele bia n'iru Ya,Ka ayi were abù ọma tikusie Ya nkpu ọṅù ike.
3 N'ihi na Chineke uku ka Jehova bu,Ọ bu kwa Eze uku nāchi chi nile.
4 Onye ebe nile nke michasiri emi nke uwa di n'aka-Ya:Ebe dichasi elu nke ugwu nile bu kwa nke Ya.
5 Onye nwere oké osimiri, Ya onwe-ya me-kwa-ra ya;Ọ bu kwa aka-Ya kpuru ala-akọro.
6 Batanu, ka ayi kpọ isi ala ruru kwa ala;Ka ayi b͕ue ikperè n'ala n'iru Jehova Onye meworo ayi: