1 Bùkuenu Jehova abù ọhu:Bùkuenu Jehova abù, unu uwa nile.
2 Bùkuenu Jehova abù, gọzienu aha-Ya;Nēzisanu ozi nzọputa-Ya site n'otù ubọchi rue ubọchi ọzọ.
3 Kọsanu akukọ ebube-Ya n'etiti mba nile,Akukọ oké ọlu-Ya nile n'etiti ndi nile di iche iche.
4 N'ihi na Jehova di uku, buru kwa onye anēto nke-uku:Onye anātu egwu Ya ka Ọ bu n'elu chi nile.
5 N'ihi na chi nile nke ndi nile di iche iche bu ihe-efu:Ma Jehova mere elu-igwe.
6 Ebube na ima-nma di n'iru Ya:Ike na nma di n'ebe nsọ Ya.
7 Nyenu Jehova, unu ab͕uru nke ndi nile di iche iche,Nyenu Jehova nsọpuru na ike.