1 Bùkuenu Jehova abù ọhu;N'ihi na Ọ luwo oké ọlu di iche iche;Aka-nri-Ya na ogwe-aka-Ya di nsọ enyewo Ya nzọputa.
2 Jehova emewo ka amara nzọputa-Ya:N'anya mba nile ka O kpugheworo ezi omume-Ya.
3 O chetawo ebere-Ya na ikwesi-ntukwasi-obi-Ya n'ebe ulo Israel di:Nsọtu nile nke uwa ahuwo nzọputa Chineke-ayi.
4 Tikusienu Jehova nkpu ọṅù ike, uwa nile:Tiwanu nkpu, tienu nkpu ọṅù, bùanu abù ọma.