5 Werenu ubọ-akwara bùkue Jehova abù ọma;Werenu ubọ-akwara na olu abù ọma.
6 Chirinu opì na olu opì-ikeTisie nkpu ọṅù ike n'iru Eze, bù Jehova.
7 Ka oké osimiri bib͕ọ, na ùjú-ya;Elu-uwa dum madu bi, na ndi bi nime ya;
8 Ka osimiri nile kua aka-ha;Ka ugwu tie nkpu ọṅù n'otù;