4 Onye nēmebi iwu, ka imi-ya si di elu, nāsi, Ọ dighi ajuju Ọ gāju.Nzube-ya nile nāsi, ọ dighi Chineke ọ bula di.
5 Uzọ-ya nile di ike na mb͕e nile;Ikpé-Gi nile di n'ebe di elu kari èbe anya-ya gēru:Ndi nile nākpab͕u ya, ọ nāpù megide ha na nleli.
6 o siwo n'obi-ya, Agaghi-ewezugam n'ọnọdum:Rue ọb͕ọ nile ọ dighi mb͕e m'gānọ n'ọdi-njọ.
7 Ọnu-ya juputara n'ọb͕ub͕a-iyi na aghughọ na mmegbu:N'okpuru ire-ya ka nmeb͕u na ajọ ihe di.
8 Ọ nānọdu n'ebe iche-anwu nke obodo ntà nile:N'ebe-nzuzo nile ka ọ nēb͕u onye nēmeghi ihe ọjọ:Anya-ya abua nēwere nzuzo nyogide onye nāhuju anya.
9 Ọ neche anwu n'ebe-nzuzo dika ọdum n'okwu-ọhia-ya:Ọ nēche anwu inwude onye ewedara n'ala:Ọ na-anwude onye ewedara n'ala, mb͕e ọ dọbatara ya n'ub͕u-ya.
10 Anāzọpia ya, ọ nāmakpu amakpu,Ndi nāhuju anya adawo kwa n'ala site n'aka ndi-ya nwere ume.