4 Obi b͕agọro ab͕agọ gēsi n'ebe m'nọ wezuga onwe-ya:Ọ dighi onye ọjọ m'gāmara.
5 Onye nēkpè madu-ibe-ya ikpè na nzuzo, onye ahu ka m'gēkpochapu:Onye nwere anya npako na obi di nganga, onye ahu ka m'nāpughi inagide.
6 Anyam abua di n'aru ndi kwesiri ntukwasi-obi n'ala, ka mu na ha we biri:Onye nēje ije n'uzọ zuru okè, onye ahu gējerem ozi.
7 Onye nālu ọlu aghughọ agaghi-ebi n'etiti ulom:Onye nēkwu okwu-ugha agaghi-eguzosi ike n'iru anyam.