1 Jehova, nuru ekperem,Ka ntikum ru kwa Gi nti.
2 Ezonarilam iru-Gi n'ubọchi ahuhu m'nāhu:Tọ nti-Gi n'ala n'ebe m'nọ;N'ubọchi m'nākpọku Gi zam ngwa ngwa.
3 N'ihi na ubọchim nile agwusiwo n'anwuru-ọku,Erechapuwo kwa ọkpukpum nile dika ọlọkọ-ọku.
4 Etib͕uwo obim dika ihe akuru n'ala, o we kpọnwua;N'ihi na echezọwom iri nrim.