9 I kpawo ókè ka ha we ghara igabiga ya;Ka ha we ghara ilaghachi ikpuchi uwa.
10 Gi Onye nēzipu isi-iyi di iche iche ka ha ba na ndagwurugwu;N'etiti ugwu ka ha nērù:
11 Ha nēnye anu ọhia ọ bula miri iṅu;Inyinya-ibu-ọhia nēmeju akpiri-ikpọ-nku-ha.
12 N'akuku ha ka anu-ufe nke elu-igwe bi,Ha nēsi n'etiti alaka-osisi me ka olu-ha da udà.
13 I bu Onye nēsi n'ime-ulo-elu-Ya nile dè ugwu nile miri:Afọ nēju uwa site na nkpuru nke ọlu-Gi nile.
14 I bu Onye nēme ka ahihia puere anu-uloNēme kwa ka ihe akuru n'ala puere ọlu-ubi madu;Ime ka nri si n'ala puta:
15 Na manya-vine nke nēme ka obi madu ṅuria,Ime ka iru-ya nēb͕upu site na manu,Na achicha nke nēme ka madu nwe ume n'obi.