20 Eze ziri ozi, we tọpu ya;Bú onye nāchi ndi di iche iche, o we tupu ya n'ulo-nkpọrọ.
21 O mere ya ka ọ buru onye-nwe ulo-ya,Na onye nāchi ihe nile o nwetara:
22 Ike ndi-isi-ya ab͕u dika nkpuru-obi-ya chọrọ,Na ime ka ndi-okenye-ya mara ihe.
23 Israel we bata nime Ijipt;Ọzọ, Jekob nọrọ dika ọbìa n'ala Ham.
24 O we me ka ndi-Ya mia nkpuru nke-uku;O we me ka ha nwe ume kari ndi nākpab͕u ha.
25 Ọ b͕anwere obi-ha ikpọ ndi-Ya asì,Ib͕agide ndi-orù-Ya ìzù ọjọ.
26 O zigara Moses, bú orù-Ya,Na Eron onye Ọ rọputara.