22 Oké ọlu di iche iche n'ala Ham,Na ihe di egwu di iche iche n'akuku Oké Osimiri Uhie.
23 O we si na O gēkpochapu ha,Ma ọ buru na Moses, bú onye Ọ rọputaworo, eguzoghi na ntiwa ahu n'iru Ya,Ime ka ọnuma-Ya si n'ibibi ha laghachi.
24 Ọzọ, ha juru ala anāchọsi ike,Ha ekweghi okwu-Ya;
25 Ha we tamu n'ulo-ikwū nile ha,Ha egeghi nti n'olu Jehova.
26 O we welie aka-Ya elu n'ebe ha nọ,Ime ka ha da n'ọzara:
27 Na ime ka nkpuru-ha da n'etiti mba nile,Na ichusa ha n'ala nile.
28 Ha kekọta-kwa-ra onwe-ha n'aru Beal-peoa,We rie àjà nile nke ihe nwuru anwu.