23 Ndi nārida n'oké osimiri n'ub͕o,Bú ndi nēje ozi n'ọtutu miri;
24 Ndi ahu ahuwo ọlu nile nke Jehova,Na oké ọlu-Ya nile nime miri nke miri emi.
25 N'ihi na Ọ nēkwu okwu, O we me ka oké ifufe guzo ọtọ,Nke nēbuli nmali-miri-ya nile elu.
26 Ha nārigoru elu-igwe, ha nāridaru ob͕u-miri nile:Nkpuru-obi-ha nālọ miri site n'ọnọdu ọjọ ha.
27 Ha nādaghari, nāṅaghari kwa dika onye ṅubigaworo manya ókè,Amam-ihe-ha nile nāla kwa n'iyì.
28 Ha we tikue Jehova n'ahuhu diri ha,Ọ we me ka ha puta na nkpà-ha nile.
29 Ọ nēme ka oké ifufe guzo n'idere du,Nmali-miri-ya nile we b͕a nkiti.