26 Ha nārigoru elu-igwe, ha nāridaru ob͕u-miri nile:Nkpuru-obi-ha nālọ miri site n'ọnọdu ọjọ ha.
27 Ha nādaghari, nāṅaghari kwa dika onye ṅubigaworo manya ókè,Amam-ihe-ha nile nāla kwa n'iyì.
28 Ha we tikue Jehova n'ahuhu diri ha,Ọ we me ka ha puta na nkpà-ha nile.
29 Ọ nēme ka oké ifufe guzo n'idere du,Nmali-miri-ya nile we b͕a nkiti.
30 Ha we ṅuria, n'ihi na ha nādaju;O we durue ha n'ótú nātọ ha utọ.
31 Ka ha kele Jehova ekele bayere ebere-Ya,Na oké ọlu-Ya nile nke Ọ nāluru umu madu!
32 Ka ha me kwa Ya ka Ọ di elu nime nkpọkọta ndi-Ya,Ka ha to kwa Ya nime nnọkọ ndi-okenye.