5 Ndi agu nāgu na ndi akpiri nākpọ nku ka ha bu,Nkpuru-obi-ha adighi-enwe ike nime ha.
6 Ha we tikue Jehova n'ahuhu diri ha,O we naputa ha n'aka nkpà-ha nile.
7 O me-kwa-ra ka ha zọ ije n'uzọ ziri ezi,Ijeru obodo obibi.
8 Ka ha kele Jehova ekele bayere ebere-Ya,Na oké ọlu-Ya nile nke Ọ nāluru umu madu!
9 N'ihi na O mewo ka afọ ju nkpuru-obi nāchọsi ihe ike,Ọ bu kwa nkpuru-obi agu nāgu ka O nyejuworo ezi ihe.
10 Ndi nānọdu n'ọchichiri na onyinyo ọnwu,Bú ndi-nkpọrọ nke nweda-n'ala na ígwè;
11 N'ihi na ha nupuru isi n'okpuru okwu Chineke,Lelì kwa ndum-ọdu nke Onye kachasi ihe nile elu: