8 Ka ha kele Jehova ekele bayere ebere-Ya,Na oké ọlu-Ya nile nke Ọ nāluru umu madu!
9 N'ihi na O mewo ka afọ ju nkpuru-obi nāchọsi ihe ike,Ọ bu kwa nkpuru-obi agu nāgu ka O nyejuworo ezi ihe.
10 Ndi nānọdu n'ọchichiri na onyinyo ọnwu,Bú ndi-nkpọrọ nke nweda-n'ala na ígwè;
11 N'ihi na ha nupuru isi n'okpuru okwu Chineke,Lelì kwa ndum-ọdu nke Onye kachasi ihe nile elu:
12 O we me ka obi-ha ruru ala n'idọb͕u onwe-ha n'ọlu;Ha suru ngọngọ, ọ dighi kwa onye nēyere ha aka.
13 Ha we tikue Jehova n'ahuhu diri ha,O we zọputa ha n'aka nkpà-ha nile.
14 O nēme ka ha si n'ọchichiri na onyinyo ọnwu puta,Ọ nētiji kwa ab͕u nile ha.