17 Ọ hu-kwa-ra nkọcha n'anya, o we biakute ya;Ngọzi atọghi kwa ya utọ, o we di anya n'ebe ọ nọ.
18 O yiri-kwa-ra nkọcha dika uwe-nwuda-ya,O we ba nime ya dika miri,Ba kwa n'ọkpukpu-ya nile dika manu.
19 Ya diri ya ka uwe oji kpuchi onwe-ya,Ya buru kwa akpukpọ-úkwù o ji ke úkwù mb͕e nile.
20 Nka bu ugwọ-ọlu nke ndi nēmegidem, nke nēsi n'aka Jehova bia,Ọ bu kwa ugwọ-ọlu nke ndi nēkwu ihe ọjọ megide nkpuru-obim.
21 Ma Gi onwe-gi, Jehova, bú Onye-nwe-ayi, kwe ka mu na I mekọ n'ihi aha-Gi:N'ihi na ebere-Gi di nma, naputam.
22 N'ihi na onye ewedara n'ala na ob͕eye ka m'bu,Adupuwo kwa nkpuru-obim nimem.
23 Dika onyinyo mb͕e ọ nēsetipu onwe-ya site n'ọdida anyanwu, otú a ka m'laworo:Arurupuwom dika igurube.