5 Ha we tukwasim ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe,Na ikpọ-asì n'ọnọdu ihu-n'anyam.
6 Me ka onye nēmebi iwu lekọta ya:Ka onye-nmegide guzo kwa n'aka-nri-ya.
7 Mb͕e anēkpe ya ikpe, ya puta ìhè na ọ bu onye ikpe mara;Ka ekpere-ya ghọ kwa nmehie.
8 Ka ubọchi-ya di ole-na-ole;Ka onye ọzọ nara ya ihe-nlekọta-ya.
9 Ka umu-ya buru umu-nb͕ei,Ka nwunye-ya buru nwayi di-ya nwuru.
10 Ka umu-ya nāṅaghari kwa mb͕e nile nāriọ kwa aririọ;Ka ha si kwa na nkponkpọ-ebe-ha nile nāchọ ihe-oriri-ha n'ebe di anya.
11 Ka onye-nbinye siri ihe nile o nwere ọnyà;Ka ndi ala ọzọ luta ihe ọ dọb͕uru onwe-ya n'ọlu inweta n'agha.