1 Tonu Ja.M'gēwere obim nile kele Jehova,N'ìzu nzuzo nke ndi ziri ezi, na nime nzukọ Israel.
2 Ọlu nile nke Jehova di uku,Buru ihe ndi nile ha nātọ utọ nāchọputa.
3 Ebube na ima-nma ka ọlu-Ya bu:Ezi omume-Ya nēguzo kwa rue mb͕e ebighi-ebi.
4 Ihe-ncheta ka O meworo nye oké ọlu-Ya nile:Onye nēme ebere na Onye nwere obi-ebere ka Jehova bu.
5 Anu-ndọb͕u ka O nyeworo ndi nātu egwu Ya:Ọ gēcheta ọb͕ub͕a-ndu-Ya rue mb͕e ebighi-ebi.
6 O gosiwo ndi-Ya ike nke ọlu-Ya nile,N'inye ha ihe-nketa mba nile.