21 M'gēkele Gi, n'ihi na I zawom,I we ghọrọm nzọputa.
22 Nkume nke ndi nēwu ulo juruAghọwo isi nkuku ulo.
23 Ọ bu n'aka Jehova ka nka sitere;Nke ahu bu oké ọlu n'anya-ayi.
24 Nka bu ubọchi Jehova meworo;Ayi gētegari egwú ọṅù, ṅuri kwa ọṅu nime ya.
25 Biko, Jehova, zọputa, biko:Biko, Jehova, me ka ihe nāgara ayi nke-ọma, biko.
26 Onye agọziri agọzi ka Onye ahu bu Nke nābia n'aha Jehova:Ayi esiwo n'ulo Jehova gọzie unu.
27 Chineke ka Jehova bu, Ọ nyewo kwa ayi ìhè:Chiri udọ̀ ke àjà-ememe, durue ya na mpi nile nke ebe-ichu-àjà.