24 Nka bu ubọchi Jehova meworo;Ayi gētegari egwú ọṅù, ṅuri kwa ọṅu nime ya.
25 Biko, Jehova, zọputa, biko:Biko, Jehova, me ka ihe nāgara ayi nke-ọma, biko.
26 Onye agọziri agọzi ka Onye ahu bu Nke nābia n'aha Jehova:Ayi esiwo n'ulo Jehova gọzie unu.
27 Chineke ka Jehova bu, Ọ nyewo kwa ayi ìhè:Chiri udọ̀ ke àjà-ememe, durue ya na mpi nile nke ebe-ichu-àjà.
28 Chinekem ka I bu, m'gēkele kwa Gi:Chinekem ka I bu, m'gēbuli Gi elu.