115 Sinu n'ebe m'nọ wezuga onwe-unu, unu ndi nēme ihe ọjọ;Ka m'we chebe ihe nile Chinekem nyere n'iwu.
116 Kwagidem dika okwu-ọnu-Gi si di, ka m'we di ndu;Eme-kwa-la ka ihere olile-anyam mem.
117 Kwaliem elu, ewe zọputam,M'gēle kwa ukpuru-Gi nile anya ọma mb͕e nile.
118 I ledawo ndi nile si n'ukpuru nile Gi jehie anya,N'ihi na okwu-ugha ka aghughọ-ha bu.
119 I nēme ka ndi nile nēmebi iwu n'uwa gwusia di ka ifuru:N'ihi ya ka m'huworo ihe-àmà-Gi nile n'anya.
120 Aji anu-arum guzoro ọtọ site n'oké egwu-Gi;Ọ bu kwa ikpé-Gi nile ka m'nātu egwu ha.
121 Emewom ikpe ekpere na ezi omume:Arapulam nye ndi nēmeb͕um.