9 Ka ndi-nchu-àjà-Gi yiri ezi omume dika uwe;Ka ndi-ebere-Gi tikwa nkpu ọnu.
10 N'ihi Devid, bú orù-Gi,Atugharila iru onye-Gi etere manu.
11 Jehova aṅuworo Devid iyi bu ezi-okwu;Ọ gaghi-esi na ya laghachi azu:Ndi sitere na nkpuru nke afọ-gi ka M'gādọkwasi n'oche-eze i nwere.
12 Ọ buru na umu-gi edebe ọb͕ub͕a-ndumNa ihe-àmàm nke M'gēzí ha,Umu-ha gānọkwasi kwa n'oche-eze i nwere rue mb͕e nile ebighi-ebi.
13 N'ihi na Jehova arọputawo Zaion;Ọ chọsiwo ya ike iburu Ya ebe-obibi.
14 Nka bu ebe-izu-ikem rue mb͕e nile ebighi-ebi:N'ebe a ka M'gēbi; n'ihi na achọsiwom ya ike.
15 Ihe-oriri-ya ka M'gāgọzi nke-uku:Ndi-ob͕eye-ya bu ndi M'gēji nri me ka afọ ju ha.