1 Tonu Ja.Nkpuru-obim, to Jehova.
2 M'gēto Jehova n'ogologo ndum nile:M'gābùku Chinekem abù ọma mb͕e m'nọ nādi ndu.
3 Unu atukwasila obi n'aru ndi amara aha-ha,Ma-ọbu n'aru nwa nke madu, onye ọ nādighi nzọputa o nwere.
4 Mọ-ya nāpu apu, o we laghachi n'ala o si puta;N'ubọchi ahu èchìchè-ya nile alawo n'iyì.
5 Onye ihe nāgara nke-ọma ka onye ahu bu nke Chineke nke Jekob bu Onye nēyere ya aka,Nke olile-anya-ya dikwasi Jehova, bú Chineke-ya: