29 N'ihi na m'nēsite na Gi b͕a ọsọ ichu usu ndi nāpunara madu ihe;Anamesite kwa na Chinekem wubiga mb͕idi.
30 Chineke, uzọ-Ya zuru okè:Okwu-ọnu Jehova bu ihe anuchara anucha;Ọta ka Ọ buru ndi nile nke nāb͕abà nime Ya.
31 N'ihi na ònye bu Chineke, ma-ọbughi Jehova?Ònye bu kwa oké nkume, ma-ọbughi Chineke-ayi?
32 Ọ bu Chineke Nke ji ike kem dika ihe-ọkiké,Ọ nēme kwa ka uzọm zue okè.
33 O nēdozi ukwum ka ha di ka ukwu nne-ele:N'elu ebem di elu ka O nēguzokwam.
34 O nēzi akam abua ibu agha;Ogwe-akam abua nārọgọ kwa uta ọla.
35 I nyewokwam ọta nzọputa-Gi:Aka-nri-Gi nākwagidekwam,Ume-ala-n'obi nke Gi nēmekwam ka m'ba uba.