6 Site n'otù nsọtu elu-igwe ka nputa-ya di,Ib͕a-buruburu-ya diru kwa nsọtu-ya nile:Ọ dighi kwa ihe ezonarioworo okpom-ọku-ya.
7 Iwu Jehova zuru okè, nēweghachi nkpuru-obi:Ihe-àmà Jehova kwesiri ntukwasi-obi, nēme ka onye nēnweghi uche mara ihe.
8 Ukpuru nile Jehova tọrọ ziri ezi, nēme ka obi ṅuria ọṅu:Ihe Jehova nyere n'iwu nēnwu enwu, nēnye anya ìhè.
9 Egwu Jehova di ọcha, nēguzo rue mb͕e ebighi-ebi:Ikpé nile nke Jehova bu ezi-okwu, ha nile ziri ezi n'otù.
10 Ihe anāchọsi ike ka ha bu, kari ọla-edo, e, kari ọtutu ọla-edo anuchara anucha:Ha di kwa utọ kari manu-aṅu bú nke si n'ub͕ub͕ọ-manu-aṅu nātasi.
11 Ọzọ, eji ha dọ orù-Gi aka na nti:N'idebe ha ka ọkpukpu-ọlu riri nne nāputa.
12 Nmehie emehieworo n'amaghi-ama, ònye ga-agbaghara ha?Guam n'onye ikpe ihe-nzuzo nile nāmaghi.