1 N'ìhi gini ka mba nile meworo oké nkpọtu?N'ìhi gini ka ndi nile di n'uwa nātughari ihe-efu n'uche?
2 Ndi-eze nke uwa nēguzo onwe-ha,Ndi-isi nāb͕akọta kwa ìzù,Imegide Jehova, na imegide onye-Ya etere manu, si,
3 Ka ayi tijie ab͕u nile ha,Tufue udọ̀ nile ha n'aru ayi.
4 Onye nānọdu n'elu-igwe nāchi ọchì:Onye-nwe-ayi nākwa ha emò.