1 Jehova za gi n'ubọchi nkpà,Aha Chineke nke Jekob me ka i nọ n'elu;
2 Si n'ebe nsọ Ya zìe iye-aka-gi,Si kwa na Zaion kwagide gi;
3 Ya cheta onyinye-gi nile i nyeworo inata iru-ọma,Ya nara kwa àjà-nsure-ọku-gi dika abuba; Selah
4 Ya nye gi dika obi-gi si acho,Mezu kwa ndum-ọdu-gi nile.