3 Ya cheta onyinye-gi nile i nyeworo inata iru-ọma,Ya nara kwa àjà-nsure-ọku-gi dika abuba; Selah
4 Ya nye gi dika obi-gi si acho,Mezu kwa ndum-ọdu-gi nile.
5 Ayi gēti nkpu ọṅù na nzọputa-Gi,Ọ bu kwa n'aha Chineke-ayi ka ayi gākwuba ọkọlọtọ-ayi nelu:Jehova mezue aririọ-gi nile.
6 Ub͕u a ka m'maworo na Jehova azọputawo onye nke Ya etere manu;O gēji idi-ike nke nzọputa nke aka-nri-YaZa ya site nelu-igwe-Ya di nsọ.
7 Ufọdu nēhota ub͕o-ala, ndi ọzọ inyinya:Ma ayi onwe-ayi nēhota aha Jehova, bú Chineke-ayi.
8 Ndi ahu eruruwo ala, da kwa ada:Ma ayi onwe-ayi ebiliwo, we guzo onwe-ayi ọtọ.