26 Ndi di ume-ala n'obi gēri ihe, riju kwa afọ:Ha gēto Jehova, bú ndi nāchọ Ya:Ka obi-unu di ndu rue mb͕e ebighi-ebi.
27 Nsọtu nile nke uwa gēcheta, laghachikute kwa Jehova:Ab͕uru nile nke mba nile gākpọ kwa isi ala n'iru Gi.
28 N'ihi na ọ bu Jehova nwe ala-eze:Ọ nāchi kwa mba nile.
29 Ndi bara uba nile nke uwa gēri ihe, kpọ kwa isi ala:N'iru Ya ka ndi nile ndi nārida n'ájá gēruru ala,Ha na onye nēdebeghi nkpuru-obi-ya ndu.
30 Otù nkpuru gēfè Ya òfùfè;Agākọrọ ọb͕ọ ọzọ akukọ a bayere Onye-nwe-ayi.