4 Na Gi ka nna-ayi-hà tukwasiri obi:Ha tukwasiri obi, I we me ka ha b͕apu.
5 Gi ka ha tikuru, eme-kwa-ra ka ha wepuga onwe-ha:Na Gi ka ha tukwasiri obi, ihere emeghi kwa ha.
6 Ma mu onwem bu idide, ọ bughi kwa madu ka m'bu;Abum ihe-ita-uta nke mmadu, na onye ndim neleda anya.
7 Ndi nile ndi nāhum nāchìm ọchi:Ha na-enu ọnu, fufè isi, si,
8 Turu onwe-gi rue Jehova aru; Ya me ka ọ b͕apu:Ya naputa ya, n'ihi na ihe-ya atọwo Ya utọ.
9 Otú ọ di, Gi onwe-gi bu onye meworo ka m'waputa n'afọ nnem:I nēme ka m'tukwasi obi mb͕e m'nọ nara nnem.
10 Na Gi ka atukwasirim site n'àkpà-nwa:Site n'afọ nnem ka Gi onwe-gi bu Chinekem.