1 Gi, Jehova, ka m'nēbuliri nkpuru-obim.
2 Chinekem, na Gi ka m'tukwasiworo obi,Ekwela ka ihere mem;Ekwela ka obi ndi-irom tọ ha utọ n'arum.
3 Ọzọ, ndi nile ndi nēle anya Gi, ihere agaghi-eme ha:Ihere gēme ndi nāghọ aghughọ n'efu.
4 Jehova, me ka m'mara uzọ-gi nile;Zím okporo-uzọ-Gi nile.