1 Gi, Jehova, ka m'nēbuliri nkpuru-obim.
2 Chinekem, na Gi ka m'tukwasiworo obi,Ekwela ka ihere mem;Ekwela ka obi ndi-irom tọ ha utọ n'arum.
3 Ọzọ, ndi nile ndi nēle anya Gi, ihere agaghi-eme ha:Ihere gēme ndi nāghọ aghughọ n'efu.
4 Jehova, me ka m'mara uzọ-gi nile;Zím okporo-uzọ-Gi nile.
5 Mem ka m'zọ ije n'ezi-okwu-Gi, Gi zíkwam ihe;N'ihi na Gi onwe-gi bu Chineke nke nzọputam;Gi ka m'nēle anya Gi ogologo ubọchi nile.
6 Cheta obi-ebere-Gi nile, Jehova, ha na ebere-Gi nile;N'ihi na site na mb͕e ebighi-ebi ka ha diworo.
7 Echetala nmehie nile m'mehiere n'okorọbiam, ha na njehiem nile:Dika ebere-Gi si di Gi onwe-gi chetam,N'ihi idi-nma-Gi, Jehova.