1 Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú onye ebupuworo njehie-ya, onye ekpuchiworo nmehie-ya.
2 Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú madu nke Jehova nādighi-aguru ya ajọ omume,Bú onye ọ dighi aghughọ ọ bula di na mọ-ya.
3 Mb͕e m'b͕ara nkiti, ọkpukpum nile kara nkáSite n'ọb͕ub͕ọ-ujam ogologo ubọchi nile.
4 N'ihi na ehihie na abali aka-Gi di arọ̀ n'arum:Umem b͕anwere n'ihe-ikpọ-nku nke uguru. Selah
5 Anamemeri ka I mara nmehiem, ekpuchighkwam ajọ omumem:M'siri, M'gēkwuputara Jehova njehiem nile;Gi onwe-Gi bupu-kwa-ra ajọ omume nke nmehiem. Selah
6 N'ihi nka ka onye-ebere ọ bula kpere Gi na mb͕e agēji chọta Gi:N'ezie n'iju-miri nke ọtutu miri ha agaghi-eru ya aru.
7 Gi onwe-gi burum ebe-nzuzo; I gēchezim ka m'pua n'ahuhu;Iti-nkpu nke mb͕e anēme ka ab͕apu, ndia ka I gēme ka ha dim buruburu. Selah