9 Aghọrọm onye-ob͕i, adighm-asaghe ọnum;N'ihi na Gi onwe-gi mere ya.
10 Si n'arum wezuga ihe-otiti-Gi:Emewo ka mu onwem gwusia site n'ilu-ọ̀gù nke aka-Gi.
11 I ji iba-nba nile dọ madu aka na nti n'ihi ajọ omume,I we me ima-nma-ya anāchọsi ike ka ọ b͕aze dika nla:N'ezie nání otù nku-ume ka madu ọ bula bu. Selah
12 Nuru ekperem, Jehova, ṅa kwa nti ntikum;Ab͕ala nkiti n'anya-mirim:N'ihi na ọbìa ka m'bu n'ebe I nọ,Abum onye-nnọdu, dika nnam-hà nile.