12 N'ihi na ihe ọjọ nādighi ọnu-ọgugu ab͕awom buruburu,Ajọ omumem nile eruwom aru, apughkwam ihu uzọ;Ha kariri agiri-isi nile nke isim n'uba, obim arapuwokwam.
13 Jehova, ka ọ tọ Gi inaputam:Jehova, bia ọsọsọ iyerem aka.
14 Ka ihere me ha, ka ha nile nwe kwa iru-ihere n'otù,Bú ndi nāchọ nkpuru-obim ikpochapu ya:Ka ha laghachi azu, ka etiye kwa ha n'ọnọdu-ihere,Bú ndi ihe ọjọ dakwasirim nātọ utọ.
15 Ka ha tọb͕ọrọ n'efu n'ihi ihere-ha,Bú ndi nāsim, Ehe, ehe.
16 Ka obi tọ ndi nile nke nāchọ Gi utọ, ka ha ṅuri kwa ọṅu nime Gi:Ka ndi nāhu nzọputa-Gi n'anya nāsi mb͕e nile,Ka Jehova di uku.